Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 10:10
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 10:10
Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
N’ọnọdụ ya
7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ.
8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị.
9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya.
12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha.
13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ.
N’asụsụ Bekee
The thief comes only to steal and kill and destroy. I have come that they may have life, and have it in all its fullness.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike