Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 3:16

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 3:16

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 3

N’ọnọdụ ya

13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.

14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.

15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”

16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.

18Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.

19Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ.

Jọn 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 3:16For God so loved the world that He gave His one and only Son, that everyone who believes in Him shall not perish but have eternal life.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 5:8Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrịị na-eme mmehie, Kraịst nwụrụ nʼihi anyị.
1Jọn 4:9–10E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.
Rom 8:32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya?
Jọn 11:25–26Jisọs gwara ya, “Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?”
Jọn 6:40Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”
Jọn 3:36Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.”
1Jọn 4:19Anyị hụrụ ya nʼanya nʼihi na o buru ụzọ hụ anyị nʼanya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike