Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:11

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 5:11

Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 5

N’ọnọdụ ya

8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè

9(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu).

10Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị.

11Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ.

12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo.

13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.

14Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.”

Ndị Efesọs 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 5:11Have no fellowship with the fruitless deeds of darkness, but rather expose them.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 13:12Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè.
1Tm 5:20Ma ndị okenye ahụ nọgidere na-eme mmehie, kpọpụta ha baara ha mba nʼihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ tụọ egwu gharakwa iso omume ha.
2Te 3:6Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị.
2Jọn 1:10–11Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya. Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
Rom 16:17Ugbu a, ụmụnna m, ana m arịọ ka unu wezuganụ onwe unu site nʼebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, na-etinye ihe mgbochi nʼụzọ unu, na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nʼihi ozizi ha na-ezi nke megidere ihe ahụ niile e ziri unu.
2Te 3:14Ma ọ bụrụ na ndị ọbụla adịghị erube isi nye ihe anyị kwuru nʼime akwụkwọ ozi a, hụbanụ ndị dị otu a ama ma kwụsịkwa iso ha nwekọ ihe ọbụla, ka ihere mekwa ha.
Abụ 1:1–2Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,
Mkp 18:4Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị, “ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ ka unu ghara iketa oke na mmehie ya, ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike