Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 6:2
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Galeshịa 6:2
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 6
N’ọnọdụ ya
1Ụmụnna m, ọ bụrụ na-anwude onye ọbụla dabara na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ na-achị kwesiri iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nʼezi ụzọ. Ma lezienụ onwe unu anya, onye ọbụla nʼime unu, nʼihi na a pụrụ ịnwakwa unu.
2Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.
3Ọ bụrụ na onye ọbụla na-eche na o nwere ihe ya bụ mgbe o nweghị ihe ọ bụ, onye ahụ na-eduhie onwe ya ụzọ.
4Ka onye ọbụla nyocha ọrụ ya, ma ọ bụrụ na ọrụ ya dị mma, mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịnya isi nʼime onwe ya na-abụghị nʼebe ọrụ onye ọzọ dị.
5Nʼihi na onye ọbụla ga-ebu ibu nke dịịrị ya.
N’asụsụ Bekee
Carry one another’s burdens, and in this way you will fulfill the law of Christ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya.Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo. Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike