Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 13:34–35
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jọn 13:34–35
34“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.
35Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”
N’ọnọdụ ya
31Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya.
32Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.
33“Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.
34“Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya.
35Ọ bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”
36Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.”
37Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.”
38Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
N’asụsụ Bekee
A new commandment I give you: Love one another. As I have loved you, so you also must love one another. By this everyone will know that you are My disciples, if you love one another.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu.Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.”Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu.Ọ bụrụ na otu akụkụ enwe nsogbu, akụkụ ndị ọzọ ga-eketa oke na nsogbu ahụ. Ọ bụrụkwa na otu akụkụ emee ihe ga-eweta otuto ọ bụ ahụ niile na-enwe otuto ahụ. Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ.Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma site nʼotu a ka unu nwee ike debezuo iwu Kraịst.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike