Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 8:32

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 8:32

Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 8

N’ọnọdụ ya

29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.”

30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.

31Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m.

32Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”

33Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?”

34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.

35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi.

Jọn 8

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 8:32Then you will know the truth, and the truth will set you free.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 8:2Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.
Jọn 8:36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
Jọn 17:17Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu.
1Pt 2:16Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
Jọn 14:6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.
Rom 6:22Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.
Rom 6:14–18Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara. Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị. Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume? Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu. Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.
Aịz 61:1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi, ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha, na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike