Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 7:24

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 7:24

Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 7

N’ọnọdụ ya

21Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya.

22Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu.

23Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike?

24Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”

25Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu?

26Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst?

27Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”

Jọn 7

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 7:24Stop judging by outward appearances, and start judging justly.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Aịz 11:3–4Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
Jem 2:9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike