Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Luk 14:28

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Luk 14:28

“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?

Gụọ isi ahụ dum: Luk 14

N’ọnọdụ ya

25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha:

26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.

27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.

28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?

29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị,

30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’

31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ?

Luk 14

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleLuke 14:28Which of you, wishing to build a tower, does not first sit down and count the cost to see if he has the resources to complete it?

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 24:27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi. Dozie ala ubi gị. Emesịa wuoro onwe gị ụlọ.
Mat 10:22Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
Jos 24:19–24Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.” Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.” Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
Luk 14:33Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike