Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jọn 14:1

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jọn 14:1

“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.

Gụọ isi ahụ dum: Jọn 14

N’ọnọdụ ya

1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m.

2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi?

3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.

4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”

Jọn 14

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJohn 14:1“Do not let your hearts be troubled. You believe in God; believe in Me as well.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Aịz 26:3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
Jọn 16:22–23Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna m nʼaha m, ọ ga-enye unu.
Aịz 12:2–3Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
2Kọ 12:9–10Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
Jọn 14:27–28Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu. “Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m.
Jọn 6:40Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”
Abụ 42:5–6O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba? Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m? Nwee olileanya na Chineke, nʼihi na m ka ga-eto ya, Onye nzọpụta m na Chineke m. Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m; ya mere, aga m echeta gị site nʼala Jọdan, na ebe dị elu nke Hemon, na sitekwa nʼugwu Miza.
Jọn 12:44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike