Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 4:26–27

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 4:26–27

26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.

27Enyela ekwensu ohere.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 4

N’ọnọdụ ya

23ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ.

24Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.

25Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.

26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.

27Enyela ekwensu ohere.

28Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.

30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.

Ndị Efesọs 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 4:26–27“Be angry, yet do not sin.” Do not let the sun set upon your anger, and do not give the devil a foothold.

Ihe e hotara n’Agba Ochie

Abụ 4:4Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jem 1:19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
Abụ 37:8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe; echegbula onwe gị, ọ na-eduba naanị nʼihe ọjọọ.
Efe 4:31–32Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
Jem 4:7Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
Ekl 7:9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ, nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.
Ilu 14:29Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.
Ilu 19:11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike