Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 4:32
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Efesọs 4:32
Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
N’ọnọdụ ya
29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.
30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.
31Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.
32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
N’asụsụ Bekee
Be kind and tenderhearted to one another, forgiving each other just as in Christ God forgave you.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu. Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala. Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst.Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya.“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike