Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:15–17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 5:15–17

15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.

16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.

17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 5

N’ọnọdụ ya

12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo.

13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè.

14Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.”

15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.

16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.

17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,

18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,

19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.

20Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Ndị Efesọs 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 5:15–17Pay careful attention, then, to how you walk, not as unwise but as wise, redeeming the time, because the days are evil. Therefore do not be foolish, but understand what the Lord’s will is.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Kọl 4:5Unu were amamihe na-achịkọta onwe unu nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, jizienụ ohere ọbụla unu nwere nke ọma.
Rom 12:2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
Jem 3:13Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.
Ems 5:13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ, nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.
Jọn 12:35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.
Fil 1:27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,
1Kọ 14:20Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nʼechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nʼihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nʼihe gbasara ụdị okwu a.
1Te 5:18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike