Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 2:10
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Efesọs 2:10
Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
N’ọnọdụ ya
7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs.
8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.
9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.
10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.
11Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).
12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.
13Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.
N’asụsụ Bekee
For we are God’s workmanship, created in Christ Jesus to do good works, which God prepared in advance as our way of life.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.Ka unu si otu a bie ndụ dị ka Onyenwe anyị chọrọ. Ka unu bụrụkwa ndị na-eme ihe ọma mgbe niile, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ nʼụzọ ọbụla, na ndị na-eto eto nʼihe banyere ịma Chineke mgbe niile.mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike