Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 7:7
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 7:7
“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
N’ọnọdụ ya
4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.
5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.
6“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-azọtọ ha ma tụgharịakwa dọrie gị.
7“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.
8Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.
9“Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute?
10Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ?
N’asụsụ Bekee
Ask, and it will be given to you; seek, and you will find; knock, and the door will be opened to you.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu. Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike