Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 4:29

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 4:29

Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 4

N’ọnọdụ ya

26Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.

27Enyela ekwensu ohere.

28Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

29Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.

30Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.

31Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.

32Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.

Ndị Efesọs 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 4:29Let no unwholesome talk come out of your mouths, but only what is helpful for building up the one in need and bringing grace to those who listen.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Kọl 4:6Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
1Te 5:11Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
Ekl 10:12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi
Ilu 15:7Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma, ma obi ndị nzuzu ezighị ezi.
Kọl 3:8–9Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta. Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a.
Mat 12:34–37Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta. Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
Ilu 25:11–12Ndụmọdụ e nyere nʼoge kwesiri ekwesi dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo e tinyere nʼefere ọlaọcha. Dịka ọlantị ọlaedo maọbụ ihe ịchọ mma nke ọlaedo mara mma ka mba onye maara ihe bụ na ntị onye na-anụ ya.
Abụ 37:30–31Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta, ire ya na-ekwukwa ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike