Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 2:8–9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 2:8–9

8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.

9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 2

N’ọnọdụ ya

5mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu.

6Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs.

7O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs.

8Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke.

9O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi.

10Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.

11Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie).

12Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa.

Ndị Efesọs 2

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 2:8–9For it is by grace you have been saved through faith, and this not from yourselves; it is the gift of God, not by works, so that no one can boast.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 3:22–26Ezi omume a na-esite nʼebe Chineke nọ abịa, site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst nye ndị niile kweere. O nweghị ihe ịdị iche ọbụla dị na ya. Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke. Ma ugbu a, agụọla ha na ndị ezi omume site nʼamara ya, site na mgbapụta nke si nʼaka Kraịst Jisọs. Onye Chineke họpụtara ka o were ndụ ya chụọ aja ikpuchi mmehie, site nʼiwufu ọbara ya maka mgbaghara mmehie, nke a ga-anata site nʼokwukwe. Nʼụzọ dị otu a, ọ na-egosipụta ezi omume ya, maka oge gara aga, nʼihi nnagide ya, o jiri ndidi leghara mmehie ụmụ mmadụ anya. Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.
Rom 4:16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.
Jọn 1:12–13Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
Rom 10:17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
Rom 10:9–10Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.
Ọrụ 16:31Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.”
Jem 1:16–18Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m. Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike