Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Galeshịa 2:20

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Galeshịa 2:20

Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Galeshịa 2

N’ọnọdụ ya

17Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba!

18Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu.

19Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe.

20Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

21Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.

Ndị Galeshịa 2

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleGalatians 2:20I have been crucified with Christ, and I no longer live, but Christ lives in me. The life I live in the body, I live by faith in the Son of God, who loved me and gave Himself up for me.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Gal 5:24Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
2Kọ 5:15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.
Rom 6:4–6Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ. Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ. Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
Kọl 3:3–4Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst. Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.
2Kọ 4:10–11Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
Rom 6:8Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
Gal 6:14Ka m gharakwa ịnya isi nʼihe ọbụla karịakwa nʼobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nke e sitere na ya kpọgbuo ụwa nʼebe m nọ, ma kpọgbukwaa mụ onwe m nʼebe ụwa nọ.
2Kọ 13:5Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike