Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:18
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Efesọs 5:18
Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
N’ọnọdụ ya
15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.
16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.
17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee,
18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ,
19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
20Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
21Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst.
N’asụsụ Bekee
Do not get drunk on wine, which leads to reckless indiscretion. Instead, be filled with the Spirit.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ.Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo.Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke. Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a. Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị.Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike