Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 5:37
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 5:37
Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
N’ọnọdụ ya
34Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.
35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.
36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.
37Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
38“Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’
39Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ.
40Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị.
N’asụsụ Bekee
Simply let your ‘Yes’ be ‘Yes,’ and your ‘No,’ ‘No.’ Anything more comes from the evil one.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke jupụtara nʼamara na-atọ ụtọ, ka unu mụtakwa otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a.E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ? Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.” Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha.Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike