Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Mak 11:24
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Mak 11:24
Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
N’ọnọdụ ya
21Pita chetara ihe merenụ ma sị ya, “Onye ozizi, lee! Osisi fiig ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”
22Jisọs zara ha sị, “Nweenụ okwukwe nʼime Chineke.
23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
24Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
25Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.
26Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
27Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.
N’asụsụ Bekee
Therefore I tell you, whatever you ask for in prayer, believe that you have received it, and it will be yours.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị. Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.“Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya.“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike