Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:4
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Efesọs 5:4
Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.
N’ọnọdụ ya
1Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya.
2Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.
3Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.
4Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.
5Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.
6Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi.
7Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ.
N’asụsụ Bekee
Nor should there be obscenity, foolish talk, or crude joking, which are out of character, but rather thanksgiving.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa, ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche.Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta. Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe. Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru. Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike