Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 12:36
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 12:36
Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
N’ọnọdụ ya
33“Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.
34Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta.
35Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.
36Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
37Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
38Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.”
39Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma.
N’asụsụ Bekee
But I tell you that men will give an account on the day of judgment for every careless word they have spoken.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs.Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya. Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike