Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 3 Jọn 1:2

Amaokwu Baịbụl · IGCB

3 Jọn 1:2

Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.

Gụọ isi ahụ dum: 3 Jọn 1

N’ọnọdụ ya

1Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.

2Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.

3Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ.

4O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.

5Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị.

3 Jọn 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible3 John 1:2Beloved, I pray that in every way you may prosper and enjoy good health, as your soul also prospers.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Pt 3:18Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Kọl 1:4–6Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya. Okwukwe na ịhụnanya nke na-esite nʼolileanya nke a kwadobere unu nʼeluigwe, nke unu nụrụla nʼokwu nke eziokwu ahụ, bụ oziọma, nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.
1Pt 4:8Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nke ukwuu nʼihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
1Te 2:13–14Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya. Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.
Abụ 20:1–5Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị. Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
2Te 1:3Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa.
Flm 1:5–7Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile. Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst. Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị.
Fil 2:4Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike