Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Taịtọs 3:2
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Taịtọs 3:2
Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.
N’ọnọdụ ya
1Chetara ndị nke gị ka ha doo onwe ha nʼokpuru ndịisi na ndị ọchịchị, ka ha rubere ha isi, dịkwa njikere ịrụ ọrụ ọma ọbụla.
2Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.
3Nʼihi na mbụ, anyị onwe anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupu isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ, na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.
4Ma mgbe obiọma na ịhụnanya Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ihe,
5ọ zọpụtara anyị, ma ọ bụghị nʼihi ezi ihe ndị anyị mere, kama ọ bụ site nʼebere ya. Ọ zọpụtara anyị site na nsacha nke ịmụ ọzọ na nnwogharị nke Mmụọ Nsọ,
N’asụsụ Bekee
to malign no one, and to be peaceable and gentle, showing full consideration to everyone.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya. Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu.Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi. Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike