Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Rom 10:17
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Rom 10:17
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
N’ọnọdụ ya
14Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
15Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.”
16Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?”
17Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst.
18Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”
19Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị, “Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu; aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.”
20Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị, “Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m, ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.”
N’asụsụ Bekee
Consequently, faith comes by hearing, and hearing by the word of Christ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma?Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.Ma ọ sịrị, kama, “Ngọzị na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke, na-emekwa ha.”Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.Ọ zara sị, “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị ahụ na-anụ okwu Chineke ma jiri ya mere ihe.”Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike