Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 7:15
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 7:15
“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.
N’ọnọdụ ya
12Ya mere, nʼime ihe niile, na-emeso ndị mmadụ dị ka i si chọọ ka ha mesoo gị. Nke a bụ nchịkọta ihe iwu na ndị amụma ziri.
13“Sitenụ nʼọnụ ụzọ dị warawara banye. Nʼihi na ọnụ ụzọ ahụ dị obosara. Mbara ka ụzọ ahụ dịkwa na-eduba nʼịla nʼiyi. Ọtụtụ na-esoro ya.
14Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.
15“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ.
16A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig?
17Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ.
18Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma.
N’asụsụ Bekee
Beware of false prophets. They come to you in sheep’s clothing, but inwardly they are ravenous wolves.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ.Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere. Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha. Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ.Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị, egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya.Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iji ozizi na amamihe efu niile nke na-achị ụwa, na aghụghọ duhie unu nʼokwukwe. Okwu amamihe ahụ nke ihe ozizi ya na ọsịsa ya niile dabeere na mmụọ nke ụwa na ntụpụta mmadụ kama ịdabere nʼihe Kraịst kwuru.Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike