Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Timoti 4:3
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Timoti 4:3
Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
N’ọnọdụ ya
1Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị,
2kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.
3Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.
4Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi.
5Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị.
6Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala.
N’asụsụ Bekee
For the time will come when men will not tolerate sound doctrine, but with itching ears they will gather around themselves teachers to suit their own desires.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi. Ya mere, ọtụtụ mmadụ ga-esoro ndụ rụrụ arụ ha na-ebi, nʼihi ha ga-ekwutọkwa ụzọ nke eziokwu ahụ. Nʼanya ukwu ha, ndị nkuzi ụgha ndị a ga-eji okwu nrafu rigbuo unu nʼuru. Site na mgbe ochie, onye ga-ekpe ha ikpe dị njikere. Onye ga-ala ha nʼiyi anaghị arahụ ụra.Ma mara nke a, na nʼoge dị oke egwu ga-adị mgbe ikpeazụ. Nʼihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ naanị onwe ha nʼanya, na ndị na-ahụ ego nʼanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwujọ ibe ha, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, maọbụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nʼobi ha. Ndị na-enweghị ịhụnanya nʼobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị na-agba asịrị, ndị na-emebiga ihe ọjọọ oke, ndị na-eme dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ. Ndị na-arara ibe ha nye nʼaka ndị iro ha, ndị isiike, ndị onwe ha juru afọ; ndị na-ahụ ihe ụtọ nke ụwa a nʼanya, kama ịhụ Chineke nʼanya. Ha bụ ndị na-ebi ndụ ndị nke Chineke ma ha adịghị egosipụta ike dị na ndụ ahụ. Zere onwe gị nʼebe ndị dị otu a nọ. Ụfọdụ nʼime ha bụ ndị na-abanye nʼime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nʼihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụobi ha agụụ.Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ. Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha. Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ,Ugbu a, aghọọla m onye iro unu, nʼihi na m na-agwa unu eziokwu?Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè. Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, ‘ Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’ Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike