Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 29:11
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ilu 29:11
Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
N’ọnọdụ ya
8Ndị nzuzu na-amalite ọgụ ebe niile, ma ndị nwere uche na-agbalịsị ike ime ka udo dị.
9Ọ bụrụ na onye maara ihe esoro onye nzuzu gaa nʼụlọikpe, onye nzuzu ga-ewe iwe ọkụ, mee mkpọtụ, kwaa emo ma udo agaghị adị.
10Ndị ndụ ha na-ebi bụ ime ihe ike na-akpọ onye eziokwu asị, ha na-achọsikwa ike ụzọ ha ga-esi gbuo onye ndụ ya ziri ezi.
11Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya, ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.
12Ọ bụrụ na onye na-achị achị aṅaa ntị nʼokwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-aghọ ndị ajọ omume.
13Ogbenye na ọgaranya bụ otu na nke a: ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka ha jiri anya ha na-ahụ ụzọ.
14Ọ bụrụ na eze esite nʼizi ezi kpee ndị ogbenye ikpe, a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike