Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:19
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jemis 1:19
Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
N’ọnọdụ ya
16Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.
17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.
22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
N’asụsụ Bekee
My beloved brothers, understand this: Everyone should be quick to listen, slow to speak, and slow to anger,Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya na-egbochiri onwe ya ọdachi.Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya.Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike