Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:5

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jemis 1:5

Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.

Gụọ isi ahụ dum: Jemis 1

N’ọnọdụ ya

2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.

3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.

4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.

5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.

6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.

7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla.

8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme.

Jemis 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJames 1:5Now if any of you lacks wisdom, he should ask God, who gives generously to all without finding fault, and it will be given to him.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 2:3–6E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo, mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
Jọn 15:7Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya.
Jer 29:12–13Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.
Ilu 3:5–7Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
1Jọn 5:14–15Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị. Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
2Ih 1:10Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
Mat 7:7–11“Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Ọ dị onye nʼime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya arịọọ ya achịcha, ga-enye ya okwute? Maọbụ, nwata ahụ arịọọ azụ, o nye ya agwọ? Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!
Jem 3:17Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike