Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Levitikọs 19:31

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Levitikọs 19:31

“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.

Gụọ isi ahụ dum: Levitikọs 19

N’ọnọdụ ya

28“ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.

29“ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.

30“ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.

31“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.

32“ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.

33“ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.

34Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.

Levitikọs 19

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleLeviticus 19:31You must not turn to mediums or spiritists; do not seek them out, or you will be defiled by them. I am the LORD your God.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Aịz 8:19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ?
Lev 20:27“ ‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ”

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike