Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jemis 1:12

Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

Gụọ isi ahụ dum: Jemis 1

N’ọnọdụ ya

9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu.

10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi.

11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya.

12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

13Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ.

14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.

15Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.

Jemis 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJames 1:12Blessed is the man who perseveres under trial, because when he has stood the test, he will receive the crown of life that God has promised to those who love Him.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 5:10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.
1Pt 1:6–8Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.
Mkp 2:10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
Jem 5:11Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.
Rom 8:28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị.
Mat 10:22Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
1Kọ 9:25Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi.
2Tm 4:8Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike