Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 4:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jemis 4:17

Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.

Gụọ isi ahụ dum: Jemis 4

N’ọnọdụ ya

14Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo.

15Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.”

16Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ.

17Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.

Jemis 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJames 4:17Anyone, then, who knows the right thing to do, yet fails to do it, is guilty of sin.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jọn 9:41Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu kpuru ìsì, ikpe ọmụma mmehie agaghị ama unu, ma ugbu a ebe unu sị na unu na-ahụ ụzọ ikpe ọmụma unu na-adịgide.”
Jọn 13:17Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.
Jọn 15:22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha.
2Pt 2:21Ọ gaara akara ha mma ma ọ bụrụ na ha amataghị ụzọ ezi omume, karịa na ha matara ya, mesịa gbakụta iwu ahụ dị nsọ nyere ha azụ.
Luk 12:47–48“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ.
Rom 1:32Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.
Rom 1:20–21Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.
Rom 7:13Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike