Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Timoti 4:12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Timoti 4:12

Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Timoti 4

N’ọnọdụ ya

9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.

10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.

11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.

12Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche.

13Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke.

14Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi.

15Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.

1 Timoti 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Timothy 4:12Let no one despise your youth, but set an example for the believers in speech, in conduct, in love, in faith, in purity.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Taị 2:7Nʼihe niile ị na-eme, mee onwe gị ihe ịma atụ ndị ọzọ ga na-eṅomi nʼime ezi omume. Na nkuzi gị niile, gosikwa izuoke na ikwesi ntụkwasị obi.
2Tm 2:22Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta.
2Tm 2:15Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma.
1Pt 5:3Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
2Pt 1:5–8Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna. Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1Kọ 11:1Unu bụrụ ndị na-eṅomi m, dịka m si eṅomi Kraịst.
1Te 1:6Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu.
2Tm 2:7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike