Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 6:12
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Efesọs 6:12
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.
N’ọnọdụ ya
9Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ.
10Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu.
11Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.
12Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.
13Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ.
14Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.
15Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu.
N’asụsụ Bekee
For our struggle is not against flesh and blood, but against the rulers, against the authorities, against the powers of this world’s darkness, and against the spiritual forces of evil in the heavenly realms.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na ọ napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya ọ hụrụ nʼanya.Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya.Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi.Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa.Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa,Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike