Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 6:16–19
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ilu 6:16–19
16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
N’ọnọdụ ya
13onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
14Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.
16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha.
22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
N’asụsụ Bekee
There are six things that the LORD hates, seven that are detestable to Him: haughty eyes, a lying tongue, hands that shed innocent blood, a heart that devises wicked schemes, feet that run swiftly to evil, a false witness who gives false testimony, and one who stirs up discord among brothers.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ?Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ, na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike