Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:27

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jemis 1:27

Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

Gụọ isi ahụ dum: Jemis 1

N’ọnọdụ ya

24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa.

25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme.

26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.

27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.

Jemis 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJames 1:27Pure and undefiled religion before our God and Father is this: to care for orphans and widows in their distress, and to keep oneself from being polluted by the world.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Aịz 1:16–17Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi, nyerenụ ndị a na-emegbu aka. Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ, ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.
1Jọn 3:17–19Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka ọ nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe ọ nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya? Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka ọ bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị. Anyị ga-esitekwa na nke a mata na anyị bụ ndị nke eziokwu ahụ ma matakwa otu anyị ga-esi mee ka obi anyị kwenye nʼihu ya.
Gal 6:9–10Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba. Nʼihi nke a, mgbe anyị nwere oghere ka anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, ọkachasị nʼebe ndị ezinaụlọ nke okwukwe anyị nọ.
Rom 12:2Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.
Aịz 58:6–7“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla? Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị, ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye. Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe, ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.
1Jọn 2:15–17Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Job 31:15–20Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị? “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi, ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei; ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe, ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
1Tm 5:4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike