Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 4:7

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jemis 4:7

Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.

Gụọ isi ahụ dum: Jemis 4

N’ọnọdụ ya

4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.

5Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”

6Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”

7Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.

8Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.

9Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ.

10Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.

Jemis 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJames 4:7Submit yourselves, then, to God. Resist the devil, and he will flee from you.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 5:8–9Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ọ ga-ala nʼiyi. Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.
Efe 4:27Enyela ekwensu ohere.
Efe 6:11–12Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.
1Pt 5:6Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.
Hib 12:9Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.
Rom 10:3Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke.
Mat 11:29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.
2Ih 30:8Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike