Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:17
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jemis 1:17
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
N’ọnọdụ ya
14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.
15Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.
16Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m.
17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke.
19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ.
20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke.
N’asụsụ Bekee
Every good and perfect gift is from above, coming down from the Father of the heavenly lights, with whom there is no change or shifting shadow.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe ọ gaghị enye unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya!Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike