Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 5:16
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jemis 5:16
Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.
N’ọnọdụ ya
13Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.
14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.
15Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.
16Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.
17Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii.
18Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.
19Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ,
N’asụsụ Bekee
Therefore confess your sins to each other and pray for each other so that you may be healed. The prayer of a righteous man has great power to prevail.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Mgbe ahụ, unu ga-abịakwute m, unu ga-abịa kpọkuokwa m nʼekpere, aga m egekwa unu ntị. Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m.Onyenwe anyị anọghị ndị na-emebi iwu nso; ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume.Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.”Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu. Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha.‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike