Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jemis 1:2–4
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jemis 1:2–4
2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.
3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.
4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.
N’ọnọdụ ya
1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ!
2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.
3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.
4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.
5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.
6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya.
7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla.
N’asụsụ Bekee
Consider it pure joy, my brothers, when you encounter trials of many kinds, because you know that the testing of your faith develops perseverance. Allow perseverance to finish its work, so that you may be mature and complete, not lacking anything.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa.Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. “Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.Ọ bụrụ na ọ dị otu a, Onyenwe anyị maara otu o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site nʼọnwụnwa niile gbara ha gburugburu. Ọ makwaara edebe ndị ajọ omume nʼahụhụ, tutu ruo ụbọchị ikpe ahụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike