Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 6:1–4

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 6:1–4

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe.

2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.

3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.

4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 6

N’ọnọdụ ya

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe.

2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke.

3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.

4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.

5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke.

6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.

7Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.

Matiu 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 6:1–4“Be careful not to perform your righteous acts before men to be seen by them. If you do, you will have no reward from your Father in heaven. So when you give to the needy, do not sound a trumpet before you, as the hypocrites do in the synagogues and on the streets, to be honored by men. Truly I tell you, they already have their full reward. But when you give to the needy, do not let your left hand know what your right hand is doing, so that your giving may be in secret. And your Father, who sees what is done in secret, will reward you.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Mat 23:5“Ihe niile ha na-eme bụ ka ndị mmadụ hụ ha. Ha na-eme ka igbe nta e tinyere iwu ndị dị mkpa e depụtara nke ha na-ekekwasị nʼegedege ihu na nʼaka dị obosara na-emekwa ka ọnụnụ uwe ha buo ibu.
Jọn 12:43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
Hib 6:10Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.
Mat 23:28–30Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume. “E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume. Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma.
Luk 16:15Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.
Mat 6:18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.
Gal 6:12Ọ bụ ndị na-achọ ka a hụ ha nʼanụ ahụ, bụ ndị ga-amanye unu ka e bie unu ugwu, naanị ihe ha ji eme otu a bụ ka a ghara ịkpagbu ha nʼihi obe Kraịst.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike