Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 6:19–21

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 6:19–21

19“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha.

20Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.

21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 6

N’ọnọdụ ya

16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.

17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri,

18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ.

19“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha.

20Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe.

21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

22“Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.

23Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.

24“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.

Matiu 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 6:19–21Do not store up for yourselves treasures on earth, where moth and rust destroy, and where thieves break in and steal. But store up for yourselves treasures in heaven, where moth and rust do not destroy, and where thieves do not break in and steal. For where your treasure is, there your heart will be also.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Kọl 3:1–3Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa. Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.
Hib 13:5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
Luk 12:34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.”
2Kọ 4:18Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
1Jọn 2:15–16Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
Luk 12:21“Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.”
Ilu 4:23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
Ilu 23:4–5Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị. Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike