Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Kọrint 10:5
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Ndị Kọrint 10:5
Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.
Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Kọrint 10
N’ọnọdụ ya
2Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya.
3Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.
4Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
5Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.
6Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
7Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
8Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.
N’asụsụ Bekee
We tear down arguments and every presumption set up against the knowledge of God; and we take captive every thought to make it obedient to Christ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu. Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu.Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?Nʼihi na ihe ahụ ụwa na-eche na ọ bụ ezi ịma ihe bụ nzuzu nʼanya Chineke. Nʼihi na e dere ya, “Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike