Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 13:11

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 13:11

Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 13

N’ọnọdụ ya

8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.

9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.

10Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.

11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.

12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.

13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.

14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

Ilu 13

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 13:11Dishonest wealth will dwindle, but what is earned through hard work will be multiplied.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 20:21Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
Ilu 10:2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike