Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 1:27
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jenesis 1:27
Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
N’ọnọdụ ya
24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị.
25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”
27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.
30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”
N’asụsụ Bekee
So God created man in His own image; in the image of God He created him; male and female He created them.E hotara ya n’Agba Ọhụrụ
Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.Ma na mmalite nke okike ụwa, Chineke ‘kere ha nwoke na nwanyị.’Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile.Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke. O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma.onye ọbụla nke a na-akpọ aha m, onye m kere nʼihi otuto m, onye m kpụrụ, ma meekwa.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike