Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 3:7
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 3:7
Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
N’ọnọdụ ya
4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
5Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.
7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
10Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
N’asụsụ Bekee
Husbands, in the same way, treat your wives with consideration as a delicate vessel, and with honor as fellow heirs of the gracious gift of life, so that your prayers will not be hindered.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike