Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 3:3–4
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 3:3–4
3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
N’ọnọdụ ya
1Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla,
2mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ.
3Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma.
4Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.
5Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.
7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
N’asụsụ Bekee
Your beauty should not come from outward adornment, such as braided hair or gold jewelry or fine clothes, but from the inner disposition of your heart, the unfading beauty of a gentle and quiet spirit, which is precious in God’s sight.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.Achọkwara m ka ndị inyom kwadoo onwe ha nʼụzọ kwesiri ekwesi, ka ha jiri nsọpụrụ na uche zuruoke chọọ onwe ha mma. Ọ bụghị isi a kpara akpa, ma ọ bụkwanụ ngwa mma nke ọlaedo maọbụ pieal, maọbụ uwe dị oke ọnụahịa ha na-eyi. Kama site nʼezi ọrụ ọma ha nke kwesiri ndị inyom na-ekwupụta na ha na-ekpere Chineke.Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọbụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama, ka ha bụrụ enyi mmadụ niile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nʼebe mmadụ niile nọ.Gị onye Farisii kpuru ìsì! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike