Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 6:33

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 6:33

Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 6

N’ọnọdụ ya

30Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị a chọọ unu mma karịa. Unu ndị okwukwe nta?

31Nʼihi nke a, unu echegbukwala onwe unu na-asị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ maọbụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ maọbụ, ‘Gịnịkwa ka anyị ga-eyi?’

32Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-amaghị Chineke na-achọsi ike. Ma Nna unu bi nʼeluigwe maara na ọ dị unu mkpa.

33Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.

34Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.

Matiu 6

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 6:33But seek first the kingdom of God and His righteousness, and all these things will be added unto you.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Luk 12:31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
Mat 5:6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju.
Jọn 6:27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”
Abụ 34:9–10Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
Abụ 84:11–12Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ. O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
Mak 10:29–30Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a, nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.
Rom 14:17Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ.
Ilu 3:9–10Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike