Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 4:1
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Jọn 4:1
Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.
N’ọnọdụ ya
1Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa.
2Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke.
3Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa.
4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
N’asụsụ Bekee
Beloved, do not believe every spirit, but test the spirits to see whether they are from God. For many false prophets have gone out into the world.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi.Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje.Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ.Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru, “Unu ekwela ka ndị amụma ahụ nọ nʼetiti unu, na ndị na-ajụ arụsị ase rafuo unu; unu egela ntị nʼakụkọ ha na-akọ banyere nrọ ndị ahụ unu na-akwagide ha ka ha rọọ. Nʼihi na amụma ha na-ebu nʼaha m bụ amụma ụgha. Ọ bụkwaghị m zitere ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig?Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike